1 John 1 1 1 John The word of life; walking in the light Igbo Contemporary Bible A pastoral letter giving believers assurance: those who walk in the light, love one another and confess Jesus come in the flesh know they have eternal life.
Introduction to 1 John
2 IGB Ndụ ahụ pụtara ihe. Anyị ahụla ya ma gbaakwa ama banyere ya. Ya mere, ihe anyị na-ekwu okwu ya, na ihe anyị na-akọrọ unu bụ banyere ndụ ebighị ebi ahụ nke ya na Nna nọ na mbụ; nke e mere ka ọ pụta ìhè nye anyị. BSB BSB: And this is the life that was revealed; we have seen it and testified to it, and we proclaim to you the eternal life that was with the Father and was revealed to us.
3 IGB Anyị na-ekwusara unu ihe anyị hụrụ na nke anyị nụrụ, ka unu soro anyị nwee nnwekọ. Nʼezie nnwekọ anyị bụ nke anyị na Nna na nke Ọkpara ya bụ Jisọs Kraịst, na-enwekọ. BSB BSB: We proclaim to you what we have seen and heard, so that you also may have fellowship with us. And this fellowship of ours is with the Father and with His Son, Jesus Christ.
4 IGB Anyị na-edere unu ihe ndị a nʼihi ime ka ọṅụ anyị zuo oke. BSB BSB: We write these things so that our joy may be complete.
5 IGB Nke a bụ ozi ahụ anyị nụrụ site nʼaka ya, nke anyị na-ekwusakwara unu. Chineke bụ ìhè, ọchịchịrị ọbụla adịghịkwa nʼime ya. BSB BSB: And this is the message we have heard from Him and announce to you: God is light, and in Him there is no darkness at all.
6 IGB Ya mere ọ bụrụ na anyị asị na anyị na ya nọ nʼezi nnwekọ ma na-ebi nʼime ọchịchịrị, ọ bụ okwu ụgha ka anyị na-ekwu. Eziokwu ahụ adịghịkwa nʼime anyị. BSB BSB: If we say we have fellowship with Him yet walk in the darkness, we lie and do not practice the truth.
7 IGB Ma ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ anyị nʼìhè, dị ka ya onwe ya si nọọ nʼìhè, mgbe ahụ anyị na ibe anyị na-enwe ezi nnwekọ. Ọbara Jisọs bụ Ọkpara ya na-asachapụkwa anyị mmehie anyị niile. BSB BSB: But if we walk in the light as He is in the light, we have fellowship with one another, and the blood of Jesus His Son cleanses us from all sin.
9 IGB Ma ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị, onye ahụ kwesiri ntụkwasị obi na onye ezi omume, ọ ga-agbaghara anyị mmehie anyị niile, sachapụkwa anyị site nʼajọ omume anyị niile. BSB BSB: If we confess our sins, He is faithful and just to forgive us our sins and to cleanse us from all unrighteousness.
10 IGB Ọ bụrụ na anyị asị na anyị emeghị mmehie ọbụla, anyị na-akpọ ya onye na-ekwu okwu ụgha, okwu ya enwekwaghị ọnọdụ nʼime anyị. BSB BSB: If we say we have not sinned, we make Him out to be a liar, and His word is not in us.
Select verses for actions: Enter goes to them and Escape comes back.
Chapter complete
You’ve read 1 John 1 What the commentators say on 1 John 1 Did Jesus really exist?
Make Opened yours A free account keeps your place, highlights and notes on every device. Add Plus to ask Study Help about 1 John 1, and keep Opened free for readers who can’t pay.